Bịafra
From Wikipedia
Bịafra
Bịafra bụla obodo ndï Ìgbo,nke pụtara ìhìe n'afọ 1967. Ndï bekee hapụrụ Naijiria na 1961, wéé nyehachi ndï ala Naijiria obodo ha. Ndï Ìgbo na ndï Hausa, bụ ndi n'achi Naijiria n'oge ahù luru ògù na 1967. Íhe butere ọgụ ahu: Ufọdụ ndi ụmụ okọrọbia agha nke Naijiria(Ọtụtụ n'ime ha bụ ndi Ìgbo)gbara mgba okpụrụ n'ebe isi ọchichi ndi isi ala anyi Naijaria nọ. Ha sitéré na mgba okpụrụ ahu wéré gbụo ụfọdụ ndi isi ala anyi (Ụfọdụ n'ime ha bụ ndi Haụsa)nke ndi bekee nyefere ọchichi n'aka tụpụ ha hapụ obodo anyi. Ha wéé gbanwe ọchichi obodo anyi ma wéré onye isi agha ha méé ye onye isi ala Naijiria. Aha ya bụ Major Aguiyi Ironsi(Ìgbo). Ọtụtụ ndi agha Naijiria bụ ndi Hausa, wéré iwe mmegwata ogbụo Major Aguiyi Ironsi, ma wéré Gen.Yakubu Gowon (Hausa-Benue) dochie anya ya. N'iwe na ọnuma ha wéré gbuo ọtụtụ ndi Ìgbo bụ ndi isi agha nke Naijiria, ya na ndi Ìgbo aka ha di ọcha nọ n'ala ndi Hausa nke bụ isiala Naijira. Lt Col.Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye na achi ndi ọwụwa anyawu Naijiria n'oge ahu, wéré juọ enyem-aka maka igbochi ogbugbu nke ndi Ígbo nọ na ala ndi Hausa, kama ndi n'achi ala anyi egeghi ya ntị. Íhe a méré ndï Igbo, ndi ikwere na ndï Ijaw jiri wéré kewapụ onwe ha na Naijiria. Ha wéré malite kpọwa onwe ha obodo "Bịafra". Ndi nachi ala Naijiria anabataghi ya. Ya mere n'afọ (Otu pụkụ,narri ịtolụ,iri isii na asaa) ma ò bụ 1967 obodo Naijiria na ala Bịafra wéé malite ọgụ. Nke gbaruru afọ atọ, ma kwụsin'afọ 1970.
Enugu Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu